Isaiah 5

Abụ banyere ubi vaịnị a gbara ogige

1Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya,
abụ banyere ubi vaịnị ya.
Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi ya
nʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala.
2O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya,
werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya.
O wuru ụlọ nche nʼetiti ya,
sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya.
Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi.
Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị.

3“Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere.
Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m.
4Olee ihe ọzọ m gaara emere ya
karịa ihe m mere?
Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ
nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ?
5Ugbu a, lee,
ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a.
Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya,
hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri.
Aga m etida mgbidi ya
hapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ.
6Agaghị m akwachakwa ya ọzọ.
Agakwaghị m egwuru ya ala,
aga m ahapụ ya ka ogwu na uke too nʼime ya.
Aga m enyekwa igwe ojii iwu
ka mmiri ghara izokwasị ya ọzọ.”

7Ubi vaịnị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
bụ mba Izrel
na ndị Juda,
ha bụ vaịnị ahụ nke nʼatọ obi ya ụtọ.
Ma o lere anya ikpe ziri ezi, ma ihe ọ hụrụ bụ iwusi ọbara.
O lere anya ezi omume, ma ihe ọ nụrụ bụ mkpu akwa ndị a na-emegbu emegbu.

Ahụhụ na ikpe ọmụma

8Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta ala
ma ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-ebi,
unu ndị na-ewu ụlọ na-ewukwasị ụlọ nʼala buru ibu,
ime ka ọ bụrụ naanị unu bi nʼụwa.
9Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ihe banyere unu, na ọnọdụ unu. Eji m ntị m abụọ nụ mgbe ọ na-asị,

“Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu,
ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa.
10Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii,
ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.”

11Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ
ịgbaso mmanya.
Ndị na-amụgide anya abalị
tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke.
12Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une,
na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu,
ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya;
unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya.
13Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ,
nʼihi amaghị ihe;
ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ,
ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri.
14Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara,
ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke;
ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo,
tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke.
15Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu,
na ndị dị ala,
ndị mpako ka a ga-eweda nʼala.
16Ma Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya,
Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya.
17Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ,
ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ.

18Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha;
ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala.
19Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa;
ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ,
ka anyị hụ ya.
Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel,
ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè,
ka anyị nwe ike mara ihe o zubere. a

20Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe
ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ,
ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè
na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị
ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ,
na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu.

21Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha,
ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta.

22Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya,
na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya,
23ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị,
ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ. c
24Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka,
na dịka ahịhịa kpọrọ nkụ si ada nʼime ọkụ na-enwu enwu,
otu a ka mgbọrọgwụ ha ga-ere ure
okoko ha ka ikuku ga-ebufu dịka uzuzu;
nʼihi na ha ajụla iwu niile Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nyere,
lelịakwa okwu nke Onye nsọ Izrel.
25Nʼihi nke a, iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide ndị ya;
o setịpụrụ aka ya na-etitu ha nʼala.
Ugwu niile ga-ama jijiji,
ozu ndị ahụ dịka ihe na-abaghị uru nʼokporoụzọ niile.

Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

26Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya,
ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa.
Ma lee, ka ha na-abịa,
ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ.
Ndị bịara buo agha a bụ ndị agha mba Asịrịa.

27Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha,
ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra,
ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ
ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi. e
28Àkụ ha niile dị nkọ,
ekweela ụta ha niile,
ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ,
ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe.
29Ha na-ebigbọ dịka ọdụm,
ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm;
ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu.
Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere.
30Nʼụbọchị ahụ, ha ga-ebigbọ nʼelu ya
dịka mbigbọ nke oke osimiri.
A sịkwa na mmadụ elegide ala ahụ anya,
ọ ga-ahụ na ọchịchịrị na ihe mgbu,
ọ bụladị anyanwụ ka igwe ojii ga-eme ka ọ gbaa ọchịchịrị.
Copyright information for IboBIU